Job 30:24
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala; mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka.
Job 30:24 in English
Job 30:24 · Berean Standard Bible
Yet no one stretches out his hand to a ruined man when he cries for help in his distress.
Context
22Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe,
ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri. 23Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ;
ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ. 24“Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala;
mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka. 25Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu;
ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye? 26Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara;
mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.