Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ; ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ.

Job 30:23 in English

Job 30:23 · Berean Standard Bible

Yes, I know that You will bring me down to death, to the place appointed for all the living.

Context

21Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere; i ji aka gị dị ike megide m. 22Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe, ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri. 23Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ; ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ. 24“Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala; mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka. 25Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu; ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.