Job 30:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke egwu abịakwasịla m; ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru, nchekwa m agabigala dịka igwe ojii.
Job 30:15 in English
Job 30:15 · Berean Standard Bible
Terrors are turned loose against me; they drive away my dignity as by the wind, and my prosperity has passed like a cloud.
Context
13Ha na-etiwasị ụzọ m,
ha kwadoro mmekpa ahụ m.
‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu. 14Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi;
nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ. 15Oke egwu abịakwasịla m;
ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru,
nchekwa m agabigala dịka igwe ojii. 16“Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga;
ụbọchị ahụhụ ejidela m. 17Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m,
ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.