Job 30:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi; nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ.
Job 30:14 in English
Job 30:14 · Berean Standard Bible
They advance as through a wide breach; through the ruins they keep rolling in.
Context
12Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha.
Ha na-esiri ụkwụ m ọnya,
ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m. 13Ha na-etiwasị ụzọ m,
ha kwadoro mmekpa ahụ m.
‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu. 14Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi;
nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ. 15Oke egwu abịakwasịla m;
ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru,
nchekwa m agabigala dịka igwe ojii. 16“Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga;
ụbọchị ahụhụ ejidela m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.