Job 30:12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha. Ha na-esiri ụkwụ m ọnya, ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m.
Job 30:12 in English
Job 30:12 · Berean Standard Bible
The rabble arises at my right; they lay snares for my feet and build siege ramps against me.
Context
10Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso;
ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu. 11Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m,
o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m. 12Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha.
Ha na-esiri ụkwụ m ọnya,
ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m. 13Ha na-etiwasị ụzọ m,
ha kwadoro mmekpa ahụ m.
‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu. 14Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi;
nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.