Job 30:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-etiwasị ụzọ m, ha kwadoro mmekpa ahụ m. ‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu.
Job 30:13 in English
Job 30:13 · Berean Standard Bible
They tear up my path; they profit from my destruction, with no one to restrain them.*
Context
11Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m,
o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m. 12Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha.
Ha na-esiri ụkwụ m ọnya,
ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m. 13Ha na-etiwasị ụzọ m,
ha kwadoro mmekpa ahụ m.
‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu. 14Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi;
nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ. 15Oke egwu abịakwasịla m;
ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru,
nchekwa m agabigala dịka igwe ojii.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.