Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma obi ha agọzighị m nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.

Job 31:20 in English

Job 31:20 · Berean Standard Bible

if his heart has not blessed me * for warming him with the fleece of my sheep,

Context

18ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri, ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ. 19Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa, maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe, 20ma obi ha agọzighị m nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya. 21Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ, nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe, 22mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ, ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.