Job 33:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso, ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.
Job 33:22 in English
Job 33:22 · Berean Standard Bible
He draws near to the Pit, and his life to the messengers of death.
Context
20Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi,
ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ. 21Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi,
ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a. 22Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,
ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi. 23Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ,
dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ,
onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya, 24ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke,
‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili;
achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.