Job 33:24
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke, ‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili; achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.
Job 33:24 in English
Job 33:24 · Berean Standard Bible
to be gracious to him and say, ‘Spare him from going down to the Pit; I have found his ransom,’
Context
22Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,
ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi. 23Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ,
dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ,
onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya, 24ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke,
‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili;
achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya. 25Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị,
ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’ 26Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,
ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ,
ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.