Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ, dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ, onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,

Job 33:23 in English

Job 33:23 · Berean Standard Bible

Yet if there is a messenger on his side, one mediator in a thousand, to tell a man what is right for him,

Context

21Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi, ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a. 22Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso, ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi. 23Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ, dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ, onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya, 24ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke, ‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili; achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya. 25Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị, ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.