Job 33:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi, ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ.
Job 33:20 in English
Job 33:20 · Berean Standard Bible
so that he detests his bread, and his soul loathes his favorite food.
Context
18ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu,
chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha. 19“Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina,
ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu. 20Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi,
ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ. 21Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi,
ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a. 22Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,
ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.