Job 33:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nwere ike kwunye ha okwu na ntị ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị;
Job 33:16 in English
Job 33:16 · Berean Standard Bible
He opens their ears and terrifies them with warnings
Context
14Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ,
ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya. 15Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị,
mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra,
mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha. 16O nwere ike kwunye ha okwu na ntị
ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị; 17ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa,
ka o si na nganga ya wezuga onwe ya, 18ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu,
chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.