Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa, ka o si na nganga ya wezuga onwe ya,

Job 33:17 in English

Job 33:17 · Berean Standard Bible

to turn a man from wrongdoing and keep him from pride,

Context

15Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị, mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra, mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha. 16O nwere ike kwunye ha okwu na ntị ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị; 17ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa, ka o si na nganga ya wezuga onwe ya, 18ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu, chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha. 19“Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina, ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.