Job 33:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike; jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka.
Job 33:5 in English
Job 33:5 · Berean Standard Bible
Refute me if you can; prepare your case and confront me.
Context
3Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m;
egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma. 4Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m,
nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ. 5Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike;
jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka. 6Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke;
mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo. 7Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ,
ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.