Job 33:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke; mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.
Job 33:6 in English
Job 33:6 · Berean Standard Bible
I am just like you before God; I was also formed from clay.
Context
4Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m,
nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ. 5Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike;
jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka. 6Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke;
mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo. 7Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ,
ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị. 8“Ma ị kwuola ya na ntị m,
anụrụ m okwu ndị ahụ niile,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.