Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Elihu gara nʼihu sị: 2“Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị
na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke. 3Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya;
aga m enye Onye kere m ezi omume. 4Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha;
onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị. 5“Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya;
ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime. 6Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ,
kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha. 7Ọ dịghị ewepụ anya ya* nʼebe ndị ezi omume nọ,
kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze,
bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi. 8Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe,
jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike, 9ọ na-agwa ha ihe ha mere,
na ha sitere na nganga ha mehie. 10Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka,
na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme. 11Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi,
ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba,
biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju. 12Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị,
ha ga-ala nʼiyi site na mma agha,
ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe. 13“Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha.
Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.* 14Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha,
nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche. 15Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha;
na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha. 16“Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu,
baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị,
baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ. 17Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị;
ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị. 18Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị;
ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị. 19Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị
ka ị ghara ịnọ na mkpagbu? 20Anọla na-echere ka abalị bịa,
mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ. 21Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe,
bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu. 22“E buliela Chineke elu nʼike ya,
onye bụ onye ozizi dịka ya? 23Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso,
maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’? 24Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu,
bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ. 25Mmadụ niile ahụzuola ya;
ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya. 26Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị.
Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta. 27“Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha,
nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile. 28Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya
mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ. 29Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii,
ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya? 30Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya
na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri. 31Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile
na-enyejukwa ha nri afọ. 32O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya,
ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ. 33Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri;
ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.
36:7 Maọbụ, ịgbakụta azụ
36:13 Ọ tara ha ahụhụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.