Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha; onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.

Job 36:4 in English

Job 36:4 · Berean Standard Bible

For truly my words are free of falsehood; one perfect in knowledge is with you.

Context

2“Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke. 3Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya; aga m enye Onye kere m ezi omume. 4Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha; onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị. 5“Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya; ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime. 6Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ, kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.