Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya; aga m enye Onye kere m ezi omume.

Job 36:3 in English

Job 36:3 · Berean Standard Bible

I get my knowledge from afar, and I will ascribe justice to my Maker.

Context

1Elihu gara nʼihu sị: 2“Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke. 3Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya; aga m enye Onye kere m ezi omume. 4Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha; onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị. 5“Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya; ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.