Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị; ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.

Job 36:17 in English

Job 36:17 · Berean Standard Bible

But now you are laden with the judgment due the wicked; judgment and justice have seized you.

Context

15Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha; na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha. 16“Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu, baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị, baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ. 17Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị; ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị. 18Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị; ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị. 19Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.