Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu, baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị, baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.

Job 36:16 in English

Job 36:16 · Berean Standard Bible

Indeed, He drew you from the jaws of distress to a spacious and broad place, to a table full of richness.

Context

14Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha, nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche. 15Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha; na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha. 16“Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu, baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị, baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ. 17Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị; ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị. 18Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị; ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.