Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile na-enyejukwa ha nri afọ.

Job 36:31 in English

Job 36:31 · Berean Standard Bible

For by these He judges * the nations and provides food in abundance.

Context

29Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii, ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya? 30Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri. 31Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile na-enyejukwa ha nri afọ. 32O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya, ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ. 33Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri; ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso. 36:7 Maọbụ, ịgbakụta azụ 36:13 Ọ tara ha ahụhụ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.