Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ na-agwa ha ihe ha mere, na ha sitere na nganga ha mehie.

Job 36:9 in English

Job 36:9 · Berean Standard Bible

then He tells them their deeds and how arrogantly they have transgressed.

Context

7Ọ dịghị ewepụ anya ya* nʼebe ndị ezi omume nọ, kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze, bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi. 8Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe, jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike, 9ọ na-agwa ha ihe ha mere, na ha sitere na nganga ha mehie. 10Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka, na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme. 11Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi, ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba, biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.