Job 36:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị ewepụ anya ya* nʼebe ndị ezi omume nọ, kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze, bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
Job 36:7 in English
Job 36:7 · Berean Standard Bible
He does not take His eyes off the righteous, but He enthrones them with kings and exalts them forever.
Context
5“Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya;
ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime. 6Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ,
kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha. 7Ọ dịghị ewepụ anya ya* nʼebe ndị ezi omume nọ,
kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze,
bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi. 8Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe,
jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike, 9ọ na-agwa ha ihe ha mere,
na ha sitere na nganga ha mehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.