Job 36:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka, na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.
Job 36:10 in English
Job 36:10 · Berean Standard Bible
He opens their ears to correction and commands that they turn from iniquity.
Context
8Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe,
jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike, 9ọ na-agwa ha ihe ha mere,
na ha sitere na nganga ha mehie. 10Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka,
na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme. 11Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi,
ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba,
biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju. 12Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị,
ha ga-ala nʼiyi site na mma agha,
ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.