Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1“Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji,
na-amali elu site nʼọnọdụ ya. 2Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya,
na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta. 3Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile,
ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ. 4Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya;
ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe,
mgbe olu ahụ dara dakwasị,
ọ naghị egbochi amụma igbu egbu. 5Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe;
ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta. 6Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’
na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’* 7Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya;
ọ na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ. 8Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe;
ha na-anọgide nʼebe obibi ha. 9Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa,
oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa. 10Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri,
ogbu mmiri na-akpụkọtakwa. 11Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri;
na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii. 12Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu
imezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha mee
nʼelu ụwa niile. 13Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ,
na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya. 14“Job, gee ntị.
Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ. 15Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii
na-eme ka amụma gbuo? 16Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe,
nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke? 17Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ
mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa, 18ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe
nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ? 19“Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya;
ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya. 20A ga-agwa ya na m nwere okwu?
Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya? 21Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya
ka ọ na-achake na mbara igwe,
mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha. 22Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta;*
Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa. 23Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu,
nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ. 24Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya,
ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”*
37:6 Ghọọ oke mmiri ozuzo
37:22 Maọbụ, nʼugwu ka ọ si na-abịa ka ebube ọlaedo
37:24 Ma ọ dịghị agụnye ndị niile na-eche na ha maara ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.