Job 37:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya ka ọ na-achake na mbara igwe, mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.
Job 37:21 in English
Job 37:21 · Berean Standard Bible
Now no one can gaze at the sun when it is bright in the skies after the wind has swept them clean.
Context
19“Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya;
ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya. 20A ga-agwa ya na m nwere okwu?
Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya? 21Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya
ka ọ na-achake na mbara igwe,
mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha. 22Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta;*
Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa. 23Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu,
nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.