Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta;* Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.

Job 37:22 in English

Job 37:22 · Berean Standard Bible

Out of the north He comes in golden splendor; awesome majesty surrounds Him.

Context

20A ga-agwa ya na m nwere okwu? Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya? 21Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya ka ọ na-achake na mbara igwe, mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha. 22Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta;* Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa. 23Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu, nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ. 24Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya, ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”* 37:6 Ghọọ oke mmiri ozuzo 37:22 Maọbụ, nʼugwu ka ọ si na-abịa ka ebube ọlaedo 37:24 Ma ọ dịghị agụnye ndị niile na-eche na ha maara ihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.