Job 37:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya; ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.
Job 37:19 in English
Job 37:19 · Berean Standard Bible
Teach us what we should say to Him; we cannot draw up our case when our faces are in darkness.
Context
17Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ
mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa, 18ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe
nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ? 19“Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya;
ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya. 20A ga-agwa ya na m nwere okwu?
Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya? 21Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya
ka ọ na-achake na mbara igwe,
mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.