Job 37:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya; ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe, mgbe olu ahụ dara dakwasị, ọ naghị egbochi amụma igbu egbu.
Job 37:4 in English
Job 37:4 · Berean Standard Bible
Then there comes a roaring sound; He thunders with His majestic voice. He does not restrain the lightning when His voice resounds.
Context
2Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya,
na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta. 3Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile,
ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ. 4Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya;
ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe,
mgbe olu ahụ dara dakwasị,
ọ naghị egbochi amụma igbu egbu. 5Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe;
ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta. 6Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’
na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.