Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya, na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta.

Job 37:2 in English

Job 37:2 · Berean Standard Bible

Listen closely to the thunder of His voice and the rumbling that comes from His mouth.

Context

1“Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji, na-amali elu site nʼọnọdụ ya. 2Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya, na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta. 3Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile, ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ. 4Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya; ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe, mgbe olu ahụ dara dakwasị, ọ naghị egbochi amụma igbu egbu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.