Job 37:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile, ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ.
Job 37:3 in English
Job 37:3 · Berean Standard Bible
He unleashes His lightning beneath the whole sky and sends it to the ends of the earth.
Context
1“Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji,
na-amali elu site nʼọnọdụ ya. 2Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya,
na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta. 3Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile,
ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ. 4Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya;
ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe,
mgbe olu ahụ dara dakwasị,
ọ naghị egbochi amụma igbu egbu. 5Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe;
ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.