Job 37:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe, nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?
Job 37:16 in English
Job 37:16 · Berean Standard Bible
Do you understand how the clouds float, those wonders of Him who is perfect in knowledge?
Context
14“Job, gee ntị.
Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ. 15Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii
na-eme ka amụma gbuo? 16Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe,
nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke? 17Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ
mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa, 18ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe
nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.