Job 37:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Job, gee ntị. Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.
Job 37:14 in English
Job 37:14 · Berean Standard Bible
Listen to this, O Job; stand still and consider the wonders of God.
Context
12Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu
imezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha mee
nʼelu ụwa niile. 13Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ,
na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya. 14“Job, gee ntị.
Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ. 15Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii
na-eme ka amụma gbuo? 16Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe,
nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.