Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Job 20
1Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị: 2“Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu. 3Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m, ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị. 4“Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie, ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa. 5Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta, ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge. 6Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe, na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii; 7ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ; ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’ 8Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla, dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu. 9Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ, ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ. 10Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye; aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya. 11Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ. 12“Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ, na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya; 13ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya, ọ na-edebe ya nʼọnụ ya, 14ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya, ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya. 15Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara; Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha. 16Ọ ga-amịcha elo agwọ, eze agwọ ajụala ga-egbu ya. 17Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi, bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ. 18Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu. Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ. 19Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla, ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị. 20“Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya; ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya. 21Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa, ọganihu ya agaghị adịgide. 22Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya, oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya. 23Mgbe o rijuru afọ ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya, iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo. 24Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga, àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ. 25Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya, site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma. Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya. 26Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya, ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya. 27Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya ụwa niile ga-ebili megide ya. 28Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya; oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke. 29Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu, ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.