Job 20:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye; aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.
Job 20:10 in English
Job 20:10 · Berean Standard Bible
His sons will seek the favor of the poor, for his own hands must return his wealth.
Context
8Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla,
dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu. 9Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ,
ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ. 10Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye;
aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya. 11Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa
ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ. 12“Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ,
na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.