Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe, na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;

Job 20:6 in English

Job 20:6 · Berean Standard Bible

Though his arrogance reaches the heavens, and his head touches the clouds,

Context

4“Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie, ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa. 5Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta, ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge. 6Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe, na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii; 7ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ; ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’ 8Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla, dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.