Job 20:24
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga, àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.
Job 20:24 in English
Job 20:24 · Berean Standard Bible
Though he flees from an iron weapon, a bronze-tipped arrow will pierce him.
Context
22Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,
oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya. 23Mgbe o rijuru afọ
ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya,
iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo. 24Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,
àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ. 25Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya,
site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma.
Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya. 26Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,
ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya
ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.