Job 20:26
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya, ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.
Job 20:26 in English
Job 20:26 · Berean Standard Bible
Total darkness is reserved for his treasures. A fire unfanned will consume him and devour what is left in his tent.
Context
24Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,
àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ. 25Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya,
site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma.
Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya. 26Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,
ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya
ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya. 27Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya
ụwa niile ga-ebili megide ya. 28Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya;
oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.