Job 20:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya, oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.
Job 20:22 in English
Job 20:22 · Berean Standard Bible
In the midst of his plenty, he will be distressed; the full force of misery will come upon him.
Context
20“Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;
ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya. 21Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,
ọganihu ya agaghị adịgide. 22Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,
oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya. 23Mgbe o rijuru afọ
ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya,
iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo. 24Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,
àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.