Job 20:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa, ọganihu ya agaghị adịgide.
Job 20:21 in English
Job 20:21 · Berean Standard Bible
Nothing is left for him to consume; thus his prosperity will not endure.
Context
19Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla,
ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị. 20“Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;
ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya. 21Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,
ọganihu ya agaghị adịgide. 22Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,
oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya. 23Mgbe o rijuru afọ
ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya,
iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.