Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Job zara sị: 2“Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ?
Ruo ole mgbe ka unu ga-ewere okwu ọnụ unu zọpịa m? 3Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m,
ihere adịghị eme unu na unu na-ebuso m agha? 4A sịkwarị na m bụ onye mmehie,
ọ bụ naanị mụ onwe m ka ọ gbasara. 5Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m,
ma were ọnọdụ ịdị ala m megide m, 6mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m,
were ụgbụ ya tụọ m gburugburu. 7“Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata;
ọ bụ ezie na m na-eti mkpu ka e nyere m aka ma ikpe ziri ezi adịghị. 8Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe;
o jirila ọchịchịrị kpuchie ụzọ m. 9O yipụla m ugwu m,
wepụkwa okpueze m kpu nʼisi. 10Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara;
ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi. 11Iwe ya dị ọkụ megide m;
ọ na-agụnyekwa m dịka onye iro ya. 12Ndị agha ya ji ike na-abịa;
ha ewuola mgbidi were nnọchibido m
ha agbaala ụlọ ikwu m gburugburu imegide m. 13“O meela ka ụmụnne m
na ndị enyi m si nʼebe m nọ pụọ. 14Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m;
ndị ezi enyi m niile echefuola m. 15Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ;
adị m ka onye mba ọzọ nʼebe ha nọ. 16Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m,
ọ bụladị mgbe m jiri ọnụ m rịọ ya. 17Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide;
abụrụla m ihe arụ nye ụmụnne m. 18Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo;
ha na-ejikwa m eme ihe ọchị mgbe ọbụla m pụtara. 19Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ;
ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m 20Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ;
ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu. 21“Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere,
nʼihi na aka Chineke na-emegide m. 22Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m?
Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ? 23“Ọ gaara atọ m ụtọ
ma a sị na e dekọrọ okwu m nʼakwụkwọ, 24na e ji mkpisi igwe dee ha,
maọbụ kakwasị ha nʼelu mbadamba nkume ruo mgbe ebighị ebi. 25Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ,
amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ. 26Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m,
ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke. 27Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya,
mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ.
Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a! 28“Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya
nʼihi na nsogbu a si nʼaka ya,’ 29unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha;
nʼihi na iwe ga-ebute ịta ahụhụ nke mma agha,
mgbe ahụ, unu ga-ama na ikpe dị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.