Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị: 2“Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu?
Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka. 3Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa,
gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị? 4Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị,
a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị?
Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha? 5“A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu;
ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu, 6ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị,
oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa. 7Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya;
atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala. 8Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya;
ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere. 9Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya,
ọnya ahụ na-ejidesi ya ike. 10E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala,
ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya. 11Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile,
na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile. 12Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike;
mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada. 13Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya;
ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile. 14Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya
duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile. 15Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya;
a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya. 16Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala,
alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu. 17A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ,
o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya. 18A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị,
otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa. 19O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya,
ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ. 20Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya;
oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya. 21Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị,
ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.