Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya, ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ.

Job 18:19 in English

Job 18:19 · Berean Standard Bible

He has no offspring or posterity among his people, no survivor where he once lived.

Context

17A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ, o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya. 18A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị, otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa. 19O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya, ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ. 20Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya; oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya. 21Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị, ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.