Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya; ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile.

Job 18:13 in English

Job 18:13 · Berean Standard Bible

It devours patches of his skin; the firstborn of death devours his limbs.

Context

11Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile, na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile. 12Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike; mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada. 13Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya; ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile. 14Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile. 15Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya; a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.