Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile.

Job 18:14 in English

Job 18:14 · Berean Standard Bible

He is torn from the shelter of his tent and is marched off to the king of terrors.

Context

12Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike; mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada. 13Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya; ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile. 14Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile. 15Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya; a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya. 16Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala, alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.