Job 18:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya; a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.
Job 18:15 in English
Job 18:15 · Berean Standard Bible
Fire resides in his tent; burning sulfur rains down on his dwelling.
Context
13Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya;
ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile. 14Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya
duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile. 15Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya;
a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya. 16Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala,
alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu. 17A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ,
o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.