Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mmụọ m tiwara etiwa,
ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ,
ili na-echere ịnabata m. 2Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu;
anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha. 3“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ.
Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe? 4I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta;
ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri. 5Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya,
anya ụmụ ya ga-ada mba. 6“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla,
meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu. 7Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ;
ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ. 8Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a;
ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume. 9Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha,
ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike. 10“Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ!
Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu. 11Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi.
Ma ọchịchọ nke obi m 12na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie;
nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso. 13Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili,
ọ bụrụ na m agbasaa* ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị, 14a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’
maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’ 15ebeekwa ka olileanya m dị?
Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya? 16Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ?
Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”
17:13 Maọbụ, atụsaa
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.