Job 17:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ. Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?
Job 17:3 in English
Job 17:3 · Berean Standard Bible
Give me, I pray, the pledge You demand. Who else will be my guarantor?
Context
1Mmụọ m tiwara etiwa,
ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ,
ili na-echere ịnabata m. 2Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu;
anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha. 3“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ.
Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe? 4I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta;
ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri. 5Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya,
anya ụmụ ya ga-ada mba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.