Job 17:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ; ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.
Job 17:7 in English
Job 17:7 · Berean Standard Bible
My eyes have grown dim with grief, and my whole body is but a shadow.
Context
5Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya,
anya ụmụ ya ga-ada mba. 6“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla,
meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu. 7Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ;
ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ. 8Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a;
ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume. 9Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha,
ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.