Job 17:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a; ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.
Job 17:8 in English
Job 17:8 · Berean Standard Bible
The upright are appalled at this, and the innocent are stirred against the godless.
Context
6“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla,
meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu. 7Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ;
ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ. 8Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a;
ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume. 9Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha,
ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike. 10“Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ!
Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.